Ezra 10

Ya mere, ndị ahụ niile si esi lọta, mere dịka mkpebi ahụ si dị. Ezra họpụtara ụfọdụ ndị ikom, ndị bụ ndịisi ezinaụlọ, e si nʼezinaụlọ ọbụla họpụta otu onye. E dekwara aha ndị niile a họpụtara nʼakwụkwọ. Ya mere, nʼụbọchị mbụ nke ọnwa iri, ndị a malitere inyocha okwu ndị a.

Ezra 10:16 (UKJV) And the children of the captivity did so. And Ezra the priest, with certain chief of the fathers, after the house of their fathers, and all of them by their names, were separated, and sat down in the first day of the tenth month to examine the matter.

14Ka ndịisi anyị guzobe mkpọkọta niile. Ka ndị niile nọ nʼobodo anyị ndị lụrụ nwanyị site na mba ọzọ bịa nʼoge a kara aka, ha na ndị okenye na ndị ikpe nke obodo ọbụla, ruo mgbe oke iwe Chineke banyere okwu a sitere nʼebe anyị nọ pụọ.”

15Ma ndị na-ekweghị ka e mee ya otu a bụ naanị Jonatan nwa Asahel na Jazeia nwa Tikva, na Meshulam na Shabetai onye Livayị.

16Ya mere, ndị ahụ niile si esi lọta, mere dịka mkpebi ahụ si dị. Ezra họpụtara ụfọdụ ndị ikom, ndị bụ ndịisi ezinaụlọ, e si nʼezinaụlọ ọbụla họpụta otu onye. E dekwara aha ndị niile a họpụtara nʼakwụkwọ. Ya mere, nʼụbọchị mbụ nke ọnwa iri, ndị a malitere inyocha okwu ndị a.

17Mgbe ọnwa atọ gasịrị, ya bụ, nʼabalị mbụ nke ọnwa mbụ nʼafọ, ha rụchara ọrụ banyere ndị ikom lụrụ ndị inyom mba ọzọ.

18A chọpụtara nʼetiti ụmụ ndị nchụaja, na ndị a lụrụ ndị inyom si na mba ọzọ. Ndị si nʼikwu Jeshua nwa Jozadak na ụmụnne ya bụ, Maaseia, Elieza, Jarib na Gedaliya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.