1Mgbe Ezra na-ekpe ekpere, na-ekwupụta mmehie ndị a, na-akwa akwa, na-atụ onwe ya nʼala nʼihu ụlọ Chineke, igwe ndị Izrel dị ukwuu, bụ ndị nwoke, na nwanyị, na ụmụntakịrị gbara ya gburugburu soro ya na-akwa akwa dị ilu.
2Mgbe ahụ, Shekanaya nwa Jehiel, onye agbụrụ Elam, sịrị Ezra, “Anyị emehiela megide Chineke anyị, nʼihi nʼịlụ ndị inyom mba ọzọ ndị gbara anyị gburugburu. Ma otu ọ dị, olileanya ka dịrị ndị Izrel.
3Ugbu a ka anyị gbaa ndụ nʼihu Chineke anyị, izilaga ndị inyom ndị mba ọzọ ndị a na ụmụ ha dịka ndụmọdụ onyenwe m Ezra, na ndị na-atụ egwu iwu Chineke anyị si dị. Ka e mee ihe ndị a dịka iwu si dị.
4Biko, bilie gwa anyị ụzọ anyị ga-esi dozie ihe niile mebiri emebi. Anyị ga-eme ihe i kwuru.”