Ezra 2

Ndị agbụrụ Parosh, puku abụọ, otu narị na iri asaa na abụọ (2,172).

Ezra 2:3 (UKJV) The children of Parosh, two thousand an hundred seventy and two.

1Ugbu a, ndị a bụ ndị obodo niile a na-achị achị, bụ ndị sitere na ndọta nʼagha nke Nebukadneza, eze Babilọn, onye dọtara ha nʼagha buru ha laa Babilọn. Ha lọghachitere na Jerusalem nakwa Juda, onye ọbụla nʼobodo nke ha.

2Ndịisi ha na Zerubabel soo, bụ Jeshua, Nehemaya, Seraya, Reelaya, Mọdekai, Bilshan, Mispa, Bigvai, Rehum na Baana. Ihe ndepụta ọnụọgụgụ ndị ikom Izrel bụ nke a:

3Ndị agbụrụ Parosh, puku abụọ, otu narị na iri asaa na abụọ (2,172).

4Ụmụ Shefataya, narị atọ na iri asaa na abụọ (372).

5Ụmụ Ara, narị asaa na iri asaa na ise (775).

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.