67Ịnyịnya kamel ha dị narị anọ na iri atọ na ise (435), ebe ịnyịnya ibu dị puku isii, na narị asaa, na iri abụọ (6,720).
68Mgbe ha bịarutere nʼụlọ Onyenwe anyị dị na Jerusalem, ụfọdụ nʼime ndịisi ezinaụlọ nyere onyinye afọ ofufu maka i ji rụzie ụlọ Chineke ka o guzo nʼọnọdụ ya.
69Onye ọbụla nʼime ha webatara nʼụlọakụ ihe o nwere ike inye nʼihi ọrụ a. Ha nyere darik ọlaedo dị puku iri isii na otu (61,000), maịna ọlaọcha dị puku ise (5,000) na onyinye uwe ndị nchụaja, otu narị (100).
70Ndị nchụaja, ndị Livayị, ndị ọbụ abụ, ndị na-eche ọnụ ụzọ ama, na ndị na-eje ozi nʼụlọnsọ, tinyere ụfọdụ ndị mmadụ ọzọkwa, ha na ndị Izrel niile fọdụrụ gara biri nʼobodo nke aka ha.