Ezra 3

Mgbe o ruru ọnwa asaa nʼafọ, ndị Izrel nọkwa nʼobodo ha niile, ndị mmadụ zukọtara nʼotu na Jerusalem.

Ezra 3:1 (UKJV) And when the seventh month was come, and the children of Israel were in the cities, the people gathered themselves together as one man to Jerusalem.

1Mgbe o ruru ọnwa asaa nʼafọ, ndị Izrel nọkwa nʼobodo ha niile, ndị mmadụ zukọtara nʼotu na Jerusalem.

2Mgbe ahụ, Jeshua, nwa Jozadak na ndị nchụaja ndị ọzọ, na Zerubabel nwa Shealtiel na ndị na-enyere ya aka malitere iwugharị ebe ịchụ aja Chineke Izrel maka ịchụ aja nsure ọkụ nʼelu ya dịka Mosis onye nke Chineke si nye nʼiwu.

3Nʼagbanyeghị oke egwu maka ndị niile gbara ha gburugburu, ha gara nʼihu wughachikwa ebe ịchụ aja ahụ na ntọala ya chụọkwa aja nʼelu ya nye Onyenwe anyị, bụ aja nsure ọkụ nke ụtụtụ na nke uhuruchi.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.