11Ha ji abụ otuto na ekele bụkuo Onyenwe anyị abụ sị: “Ọ dị mma, ịhụnanya ya nʼebe Izrel nọ na-adị ruo ebighị ebi.” Mmadụ niile jiri oke olu too Onyenwe anyị nʼihi ntọala ụlọnsọ ukwu ahụ ha tọrọ.
12Ma ụfọdụ ndị merela agadi nʼetiti ndị nchụaja, na ndị Livayị, na ndị ndu nke ikwu dị iche iche, bụ ndị chetara ụlọnsọ ukwu ahụ Solomọn wuru, kwara akwa hie nne, mgbe ndị ọzọ nọ na-eti mkpu ọṅụ.
13Ya mere, e sitere nʼebe dị nnọọ anya nụ ụzụ ọṅụ na ụda akwa ndị mmadụ ahụ. Ma o nweghị onye nwere ike ịkọwata nke bụ mkpu akwa maọbụ mkpu ọṅụ, nʼihi na ụzụ ahụ dị ukwuu.