13Anyị chọrọ ka o doo gị anya na ọ bụrụ na ha ewuchaa ya, ọ ga-abụ nsogbu nye alaeze gị, nʼihi na ndị Juu agaghị ekwekwa ịtụrụ gị ụtụ isi ha.
14Ebe anyị na-asọpụrụ gị dịka nna anyị ukwu, anyị achọghị ka ihe ọjọọ mee nʼalaeze gị, ya mere anyị ji kpebie idere gị akwụkwọ a.
15Anyị chọrọ ka i leba anya nʼakwụkwọ akụkọ nke mgbe ochie, ka ị chọpụta na ọ dịghị mgbe Jerusalem na-ejighị bụrụ obodo nnupu isi. Nʼezie, ọ bụ nʼihi nnupu isi a na nkwulu nke ha na-ekwulu ndị eze dị iche iche, ka e ji bibie ya na mbụ.
16Anyị chọrọ ka ị mata na ọ bụrụ na e wuchaa mgbidi obodo a, ọ ga-esi ike ka akụkụ alaeze gị a, nke dị ruo nʼosimiri Yufretis, bụrụkwa nke gị ọzọ.
17Eze ahụ si otu a saa akwụkwọ ahụ, Ọ sịrị ha, Rehum onyeisi ọchịchị, na Shimshai ode akwụkwọ, na ndị otu ha bi na Sameria ruo nʼọdịda anyanwụ nke osimiri Yufretis. Ndeewonụ.