11Nke a bụ ihe ha dere nʼakwụkwọ ha zigaara Eze Ataksekses. Ọ bụ gị, eze ukwu Ataksekses, ka ndị ohu gị bi nʼakụkụ ọdịda anyanwụ Yufretis na-edetara akwụkwọ a.
12Nke a bụ ime ka ị mata na ndị Juu si Babilọn lọta Jerusalem ọhụrụ a ebidola iwughachi obodo ọjọọ nke nnupu isi ahụ. Ha ewuolarị mgbidi ya, tọkwaa ntọala ya.
13Anyị chọrọ ka o doo gị anya na ọ bụrụ na ha ewuchaa ya, ọ ga-abụ nsogbu nye alaeze gị, nʼihi na ndị Juu agaghị ekwekwa ịtụrụ gị ụtụ isi ha.
14Ebe anyị na-asọpụrụ gị dịka nna anyị ukwu, anyị achọghị ka ihe ọjọọ mee nʼalaeze gị, ya mere anyị ji kpebie idere gị akwụkwọ a.
15Anyị chọrọ ka i leba anya nʼakwụkwọ akụkọ nke mgbe ochie, ka ị chọpụta na ọ dịghị mgbe Jerusalem na-ejighị bụrụ obodo nnupu isi. Nʼezie, ọ bụ nʼihi nnupu isi a na nkwulu nke ha na-ekwulu ndị eze dị iche iche, ka e ji bibie ya na mbụ.