Ezra 4

Jerusalem e nweela ụfọdụ ndị eze nke chịrị nʼIzrel, ndị dị ike a maara aha ha, ndị alaeze ha gbasara rute nʼosimiri Yufretis, ndị a na-atụkwara ụtụ dị iche iche.

Ezra 4:20 (UKJV) There have been mighty kings also over Jerusalem, which have ruled over all countries beyond the river; and toll, tribute, and custom, was paid unto them.

18Akwụkwọ ozi ahụ unu zitere anyị, agụọla ma tapịakwaa ya nʼihu m.

19Enyere m iwu ka e nyochaa chọpụta, e mere nyochaa, a chọpụtakwara ya nʼakwụkwọ na obodo a siterị nʼoge gara aga bụ obodo na-ebuli onwe ya megide ọtụtụ ndị eze, bụrụkwa ebe na-akpali nnupu isi na okwu na-eweta ọgbaaghara.

20Jerusalem e nweela ụfọdụ ndị eze nke chịrị nʼIzrel, ndị dị ike a maara aha ha, ndị alaeze ha gbasara rute nʼosimiri Yufretis, ndị a na-atụkwara ụtụ dị iche iche.

21Ugbu a, nye iwu ka ndị ikom ndị ahụ kwụsị ọrụ, ka a ghara iwuzi obodo a tutu ruo mgbe m ga-enye iwu.

22Lezienụ anya ka unu ghara i lepụrụ okwu a anya. Gịnị ga-eme ka a hapụ ihe iyi egwu a ka ọ gaa nʼihu, ime ka ihe jọrọ alaeze a njọ karịa?

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.