22Lezienụ anya ka unu ghara i lepụrụ okwu a anya. Gịnị ga-eme ka a hapụ ihe iyi egwu a ka ọ gaa nʼihu, ime ka ihe jọrọ alaeze a njọ karịa?
23Ngwangwa a gụrụ akwụkwọ ozi si nʼaka eze Ataksekses, nye Rehum na Shimshai bụ ode akwụkwọ, na ndị otu ha, ha mere ọsịịsọ gakwuru ndị Juu na Jerusalem jiri ike kwagide ha ka ha kwụsị ịrụ ọrụ ahụ.
24Ya mere, ha kwụsịrị ịrụ ọrụ nʼụlọnsọ ukwu Chineke na Jerusalem tutu ruo nʼafọ abụọ nke ọchịchị Daraiọs eze Peshịa.