7Nʼụbọchị niile ahụ Ataksekses bụ eze ndị Peshịa, ka Bishlam, na Mitredat, na Tabeel, na ndị otu ya fọdụrụ degaara Ataksekses akwụkwọ. E dere akwụkwọ ozi ahụ nʼodide akwụkwọ ndị Aramaik, a sụgharịkwara ya nʼasụsụ Aramaik.
8Ndị ọzọ soro ha gbaa ajọ izu a bụ Rehum onyeisi ọchịchị, na Shimshai ode akwụkwọ. Ha deere Ataksekses akwụkwọ megide ndị Jerusalem sị ya:
9“Akwụkwọ ozi a si nʼaka Rehum, onyeisi agha na Shimshai ode akwụkwọ, na ndị otu anyị ndị ọzọ, na ndị ikpe, na ndịisi obodo na-elekọta ndị ahụ niile si Tripolis, na Peshịa, na Erek, na Babilọn, na Susa nke dị nʼElam,
10na ọtụtụ ndị ọzọ ahụ onye ukwu ahụ na onye a na-asọpụrụ bụ Ashobanipal si nʼala ha bupụ bute na Sameria, na obodo ndị ọzọ dị nʼọdịda anyanwụ Yufretis.”
11Nke a bụ ihe ha dere nʼakwụkwọ ha zigaara Eze Ataksekses. Ọ bụ gị, eze ukwu Ataksekses, ka ndị ohu gị bi nʼakụkụ ọdịda anyanwụ Yufretis na-edetara akwụkwọ a.