Ezra 5

O sikwa nʼụlọnsọ dị na Babilọn wepụta ngwongwo ọlaọcha na ọlaedo si nʼụlọnsọ Chineke nke Nebukadneza si nʼụlọnsọ Chineke dị na Jerusalem bupụ bulaa nʼụlọnsọ dị na Babilọn. Mgbe ahụ eze Sairọs nyefere ha nʼaka otu nwoke a na-akpọ Sheshbaza, onye ọ họpụtara dịka gọvanọ.

Ezra 5:14 (UKJV) And the vessels also of gold and silver of the house of God, which Nebuchadnezzar took out of the temple that was in Jerusalem, and brought them into the temple of Babylon, those did Cyrus the king take out of the temple of Babylon, and they were delivered unto one, whose name was Sheshbazzar, whom he had made governor;

12Ma nʼihi na nna nna anyị ha mere ka iwe wee Chineke nke eluigwe, o weere ha nyefee nʼaka Nebukadneza, onye Kaldịa, bụ eze Babilọn, onye bibiri ụlọnsọ a ma dọrọ ndị bi nʼala ahụ nʼagha laa Babilọn.

13“Ma otu ọ dị, nʼafọ mbụ nke ọchịchị Sairọs, eze Babilọn, eze Sairọs nyere iwu ka e wugharịa ụlọnsọ Chineke a.

14O sikwa nʼụlọnsọ dị na Babilọn wepụta ngwongwo ọlaọcha na ọlaedo si nʼụlọnsọ Chineke nke Nebukadneza si nʼụlọnsọ Chineke dị na Jerusalem bupụ bulaa nʼụlọnsọ dị na Babilọn. Mgbe ahụ eze Sairọs nyefere ha nʼaka otu nwoke a na-akpọ Sheshbaza, onye ọ họpụtara dịka gọvanọ.

15Ọ gwara ya sị, ‘buru ngwongwo ndị a bulaa ha nʼụlọnsọ dị na Jerusalem, wugharịakwa ụlọnsọ Chineke nʼọnọdụ ya mbụ.’

16“Ya mere, ọ bụ Sheshbaza a bịara tọọ ntọala ụlọnsọ dị na Jerusalem. Sitekwa nʼoge ahụ ruo ugbu a, ha nọ na-arụ ya ma ha arụchabeghị ya.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.