Ezra 6

Emesịa, a chọpụtara otu akwụkwọ nʼụlọeze dị na Ekbatana nʼala Midia. Nke a bụ ihe e dere nʼime akwụkwọ ahụ: Akwụkwọ ozi eze;

Ezra 6:2 (UKJV) And there was found at Achmetha, in the palace that is in the province of the Medes, a roll, and therein was a record thus written:

1Ya mere, Daraiọs nyere iwu ka a chọpụta nʼụlọ a na-echebe akwụkwọ ochie nke ndị Babilọn ma ọ dị akwụkwọ ọbụla dị otu ahụ.

2Emesịa, a chọpụtara otu akwụkwọ nʼụlọeze dị na Ekbatana nʼala Midia. Nke a bụ ihe e dere nʼime akwụkwọ ahụ: Akwụkwọ ozi eze;

3Nʼafọ mbụ nke Sairọs bụ eze, o nyere iwu banyere ụlọnsọ ukwu Chineke dị na Jerusalem ebe ndị Juu na-efe Chineke. A ga-ewughachi ụlọnsọ ukwu ahụ ka ọ bụrụ ebe ịchụ aja, ka a tọsiekwa ntọala ya ike. Ịdị elu ya ga-adị iri mita atọ, obosara ya ga-abụkwa otu ihe ahụ.

4Ahịrị atọ nke oke nkume ka a ga-eji tọọ ntọala ya, tinyere otu ahịrị osisi. A ga-esi nʼụlọakụ eze Sairọs kwụọ ụgwọ ihe ndị a niile.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.