1Ya mere, Daraiọs nyere iwu ka a chọpụta nʼụlọ a na-echebe akwụkwọ ochie nke ndị Babilọn ma ọ dị akwụkwọ ọbụla dị otu ahụ.
2Emesịa, a chọpụtara otu akwụkwọ nʼụlọeze dị na Ekbatana nʼala Midia. Nke a bụ ihe e dere nʼime akwụkwọ ahụ: Akwụkwọ ozi eze;
3Nʼafọ mbụ nke Sairọs bụ eze, o nyere iwu banyere ụlọnsọ ukwu Chineke dị na Jerusalem ebe ndị Juu na-efe Chineke. A ga-ewughachi ụlọnsọ ukwu ahụ ka ọ bụrụ ebe ịchụ aja, ka a tọsiekwa ntọala ya ike. Ịdị elu ya ga-adị iri mita atọ, obosara ya ga-abụkwa otu ihe ahụ.