15Ọ gwara ya sị, ‘buru ngwongwo ndị a bulaa ha nʼụlọnsọ dị na Jerusalem, wugharịakwa ụlọnsọ Chineke nʼọnọdụ ya mbụ.’
16“Ya mere, ọ bụ Sheshbaza a bịara tọọ ntọala ụlọnsọ dị na Jerusalem. Sitekwa nʼoge ahụ ruo ugbu a, ha nọ na-arụ ya ma ha arụchabeghị ya.”
17Ugbu a, ọ bụrụ na ọ dị eze mma nʼobi, ya nye iwu ka e nyochaa nʼụlọ a na-echebe akwụkwọ ochie nke ndị eze Babilọn, ịchọpụta maọbụ eziokwu na eze Sairọs nyere iwu dị otu a iwugharị ụlọnsọ Chineke dị na Jerusalem. Ka eze gwakwa anyị ihe bụ mkpebi ya banyere okwu a.