11Nke a bụ ndepụta akwụkwọ ozi eze, bụ Ataksekses degaara Ezra onye nchụaja, na onye ozizi, na onye ọka nʼihe gbasara iwu na ụkpụrụ nke Onyenwe anyị nyere Izrel:
12Ataksekses, eze na-achị ndị eze ọzọ, na-edegara Ezra akwụkwọ, bụ onye nchụaja, bụrụkwa onye nkuzi okwu Chineke nke eluigwe. Ndeewo!
13Ugbu a, ana m enye iwu ka onye Izrel ọbụla bi nʼalaeze m, ma ndị nchụaja, na ndị Livayị, ndị wepụtara onwe ha ị soro gị gaa Jerusalem, ha nwere ike ịga.
14Eze na mmadụ asaa ndị na-adụ ya ọdụ na-eziga gị Juda na Jerusalem ka ị gaa leba anya nʼiwu Chineke nke dị gị nʼaka.
15Ọzọkwa, ịga e were onyinye ọlaedo na ọlaọcha ndị a eze na ndị ndụmọdụ ya ji afọ ofufu nye Chineke nke Izrel, onye ebe obibi ya dị na Jerusalem.