9Ọ hapụrụ Babilọn nʼabalị mbụ nke ọnwa mbụ, rute Jerusalem nʼabalị mbụ nke ọnwa ise nʼihi na Chineke nọnyeere ya.
10Nke a mere nʼihi na Ezra kpebiri nʼobi ya ịmụ, na idebe iwu Onyenwe anyị, na ịbụ onye ozizi nke okwu Chineke nye ụmụ Izrel.
11Nke a bụ ndepụta akwụkwọ ozi eze, bụ Ataksekses degaara Ezra onye nchụaja, na onye ozizi, na onye ọka nʼihe gbasara iwu na ụkpụrụ nke Onyenwe anyị nyere Izrel:
12Ataksekses, eze na-achị ndị eze ọzọ, na-edegara Ezra akwụkwọ, bụ onye nchụaja, bụrụkwa onye nkuzi okwu Chineke nke eluigwe. Ndeewo!
13Ugbu a, ana m enye iwu ka onye Izrel ọbụla bi nʼalaeze m, ma ndị nchụaja, na ndị Livayị, ndị wepụtara onwe ha ị soro gị gaa Jerusalem, ha nwere ike ịga.