7Ụfọdụ ndị Izrel, ndị nchụaja, ndị Livayị, ndị ọbụ abụ, ndị nche na ndị na-eje ozi nʼụlọnsọ, soro ya jee Jerusalem nʼafọ asaa nke ọchịchị eze Ataksekses.
8Ezra bịaruru Jerusalem nʼọnwa nke ise, nke afọ asaa nke ọchịchị eze.
9Ọ hapụrụ Babilọn nʼabalị mbụ nke ọnwa mbụ, rute Jerusalem nʼabalị mbụ nke ọnwa ise nʼihi na Chineke nọnyeere ya.
10Nke a mere nʼihi na Ezra kpebiri nʼobi ya ịmụ, na idebe iwu Onyenwe anyị, na ịbụ onye ozizi nke okwu Chineke nye ụmụ Izrel.
11Nke a bụ ndepụta akwụkwọ ozi eze, bụ Ataksekses degaara Ezra onye nchụaja, na onye ozizi, na onye ọka nʼihe gbasara iwu na ụkpụrụ nke Onyenwe anyị nyere Izrel: