Ezra 7

Ọ bụrụ na ego amapụta nʼime ya, gị na ụmụnne gị ga-eji ya mee ihe unu maara bụ uche Chineke unu.

Ezra 7:18 (UKJV) And whatsoever shall seem good to you, and to your brethren, to do with the rest of the silver and the gold, that do after the will of your God.

16Tinyere ọlaedo na ọlaọcha nke i nwere ike ịnata nʼala ahụ niile nʼakụkụ niile nke Babilọn, tinyekwara onyinye ihuọma si nʼaka ndị mmadụ, na ndị nchụaja niile, maka ụlọnsọ ukwu Chineke ha dị na Jerusalem.

17Ị ga-eji ego niile ndị a zụọ oke ehi, na ebule, na atụrụ, na onyinye mkpụrụ ọka, na onyinye ihe ọṅụṅụ, e ji achụ aja nʼebe ịchụ aja nke ụlọnsọ Chineke dị na Jerusalem.

18Ọ bụrụ na ego amapụta nʼime ya, gị na ụmụnne gị ga-eji ya mee ihe unu maara bụ uche Chineke unu.

19Ngwongwo niile e bunyere gị maka ije ozi nʼụlọnsọ Chineke, buru ha buruo nʼihu Chineke nke Jerusalem.

20Ma ihe ndị ọzọ nke fọdụrụ nʼihi ụlọnsọ Chineke gị, nke kwesiri na i mere, ị nwere ike site nʼụlọakụ eze mee ha.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.