Ezra 7

Ngwongwo niile e bunyere gị maka ije ozi nʼụlọnsọ Chineke, buru ha buruo nʼihu Chineke nke Jerusalem.

Ezra 7:19 (UKJV) The vessels also that are given you for the service of the house of your God, those deliver you before the God of Jerusalem.

17Ị ga-eji ego niile ndị a zụọ oke ehi, na ebule, na atụrụ, na onyinye mkpụrụ ọka, na onyinye ihe ọṅụṅụ, e ji achụ aja nʼebe ịchụ aja nke ụlọnsọ Chineke dị na Jerusalem.

18Ọ bụrụ na ego amapụta nʼime ya, gị na ụmụnne gị ga-eji ya mee ihe unu maara bụ uche Chineke unu.

19Ngwongwo niile e bunyere gị maka ije ozi nʼụlọnsọ Chineke, buru ha buruo nʼihu Chineke nke Jerusalem.

20Ma ihe ndị ọzọ nke fọdụrụ nʼihi ụlọnsọ Chineke gị, nke kwesiri na i mere, ị nwere ike site nʼụlọakụ eze mee ha.

21Mụ, bụ Ataksekses, na-eziga iwu a nye ndị na-elekọta ego nʼọdịda anyanwụ osimiri Yufretis sị ha, ihe ọbụla Ezra, onye nchụaja, na onye nkuzi okwu Chineke nke eluigwe chọrọ site nʼaka unu, unu nye ya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.