Ezra 7

Ihe ọbụla ọzọ, nke Chineke nke eluigwe chọrọ, ka e mee ha nʼụzọ kwesiri nye maka owuwu ụlọnsọ Chineke nke eluigwe. Nʼihi gịnị ka iwe Chineke ga-eji dakwasị eze na ụmụ ya ndị ikom?

Ezra 7:23 (UKJV) Whatsoever is commanded by the God of heaven, let it be diligently done for the house of the God of heaven: for why should there be wrath against the realm of the king and his sons?

21Mụ, bụ Ataksekses, na-eziga iwu a nye ndị na-elekọta ego nʼọdịda anyanwụ osimiri Yufretis sị ha, ihe ọbụla Ezra, onye nchụaja, na onye nkuzi okwu Chineke nke eluigwe chọrọ site nʼaka unu, unu nye ya.

22Ọ bụladị ruo ọlaọcha dị otu narị talenti, ya na narị akpa ọka wiiti ise, na narị galọọnụ mmanya vaịnị isii, na narị efa nke mmanụ oliv na nnu nʼọtụtụ ọbụla, dịka ọ chọrọ ya.

23Ihe ọbụla ọzọ, nke Chineke nke eluigwe chọrọ, ka e mee ha nʼụzọ kwesiri nye maka owuwu ụlọnsọ Chineke nke eluigwe. Nʼihi gịnị ka iwe Chineke ga-eji dakwasị eze na ụmụ ya ndị ikom?

24Ana m enyekwa iwu na ndị nchụaja niile, ndị Livayị niile, ndị ọbụ abụ niile, ndị nche niile, ndị ozi ụlọnsọ niile, na ndị ọzọ niile na-arụrụ Chineke ọrụ, agaghị atụ ụtụ ọbụla.

25“Ugbu a, Ezra, ị ga-eji amamihe Chineke gị nyere gị họpụta ndị ikpe, na ndịisi, ndị ga-achị obodo niile dị nʼọdịda anyanwụ nke osimiri Yufretis. Ọ bụrụ na ha amazighị iwu Chineke nke ọma, ị ga-akụziri ha.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.