Ezra 8

Akpọkọtara m ha nʼakụkụ osimiri na-erubanye nʼAhava, anyị nọrọ nʼebe ahụ ụbọchị atọ. Mgbe m leruru anya nʼetiti ndị mmadụ zukọrọnụ, ha na ndị nchụaja bịara, a chọpụtara m na o nweghị ọ bụladị otu onye Livayị nọ nʼebe ahụ.

Ezra 8:15 (UKJV) And I gathered them together to the river that runs to Ahava; and there abode we in tents three days: and I viewed the people, and the priests, and found there none of the sons of Levi.

13Ndị sitere nʼikwu Adonikam, ndị ikpeazụ, ndị aha ha bụ Elifelet, na Jeuel na Shemaya na iri ndị ikom isii (60) bụ ndị so ha,

14ndị sitere nʼikwu Bigvai, Utai na Zakua na iri ndị ikom asaa (70) bụ ndị so ha.

15Akpọkọtara m ha nʼakụkụ osimiri na-erubanye nʼAhava, anyị nọrọ nʼebe ahụ ụbọchị atọ. Mgbe m leruru anya nʼetiti ndị mmadụ zukọrọnụ, ha na ndị nchụaja bịara, a chọpụtara m na o nweghị ọ bụladị otu onye Livayị nọ nʼebe ahụ.

16Mgbe ahụ, ezigara m ozi kpọọ Elieza, Ariel, Shemaya, Elnatan, Jarib, Elnatan, Netan, Zekaraya na Meshulam, ndị bụ ndịisi. Ezikwara m ozi kpọọ Joiarib na Elnatan, bụ ndị maara ihe.

17Enyere m ha iwu ka ha gakwuru Ido, onyendu nọ na Kasifia. Agwara m ha ihe ha ga-agwa Ido na ndị Livayị ibe ya, bụ ndị na-eje ozi nʼụlọnsọ dị na Kasifia, ka ha zite ndị ga-eje ozi ka ha bịakwute anyị maka ụlọnsọ Chineke.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.