Ezra 8

Mgbe ahụ, ezigara m ozi kpọọ Elieza, Ariel, Shemaya, Elnatan, Jarib, Elnatan, Netan, Zekaraya na Meshulam, ndị bụ ndịisi. Ezikwara m ozi kpọọ Joiarib na Elnatan, bụ ndị maara ihe.

Ezra 8:16 (UKJV) Then sent I for Eliezer, for Ariel, for Shemaiah, and for Elnathan, and for Jarib, and for Elnathan, and for Nathan, and for Zechariah, and for Meshullam, chief men; also for Joiarib, and for Elnathan, men of understanding.

14ndị sitere nʼikwu Bigvai, Utai na Zakua na iri ndị ikom asaa (70) bụ ndị so ha.

15Akpọkọtara m ha nʼakụkụ osimiri na-erubanye nʼAhava, anyị nọrọ nʼebe ahụ ụbọchị atọ. Mgbe m leruru anya nʼetiti ndị mmadụ zukọrọnụ, ha na ndị nchụaja bịara, a chọpụtara m na o nweghị ọ bụladị otu onye Livayị nọ nʼebe ahụ.

16Mgbe ahụ, ezigara m ozi kpọọ Elieza, Ariel, Shemaya, Elnatan, Jarib, Elnatan, Netan, Zekaraya na Meshulam, ndị bụ ndịisi. Ezikwara m ozi kpọọ Joiarib na Elnatan, bụ ndị maara ihe.

17Enyere m ha iwu ka ha gakwuru Ido, onyendu nọ na Kasifia. Agwara m ha ihe ha ga-agwa Ido na ndị Livayị ibe ya, bụ ndị na-eje ozi nʼụlọnsọ dị na Kasifia, ka ha zite ndị ga-eje ozi ka ha bịakwute anyị maka ụlọnsọ Chineke.

18Chineke gosikwara anyị obiọma zitere anyị nwoke a na-akpọ Sherebaya na ụmụ ya, na ụmụnne ya, ndị ọnụọgụgụ ha dị iri na asatọ (18). Sherebaya bụ nwa Mahali, nwa Livayị nwa Izrel, bụrụkwa nwoke nwere ezi uche.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.