26E jiri m ihe ọtụtụ tụnye ha ọlaọcha dị narị talenti isii na iri ise (ya bụ 650), na ngwongwo ọlaọcha dị otu narị talenti (ya bụ 100), na ọlaedo dị otu narị talenti (ya bụ 100).
27Iri efere ọlaedo abụọ (20) nke ọnụahịa ya bụ puku darik (1,000), tinyere efere bronz abụọ e hichaziri nke ọma, nke dị oke ọnụahịa dị ka efere ọlaedo.
28Emesịa, agwara m ha okwu sị ha, “Lee, unu onwe unu na ihe ndị a niile bụ ihe dị nsọ nye Onyenwe anyị. Ọlaọcha na ọlaedo ndị a bụkwa onyinye afọ ofufu e nyere Onyenwe anyị Chineke nna nna unu ha.
29Chenụ ha nche, debekwa ha nke ọma, tupu ruo mgbe unu ga-atụ ha nʼihu ndịisi nchụaja, na ndịisi Livayị, na ndịisi ụlọ nke Izrel nʼime Jerusalem, nʼime ụlọakụ nke ụlọ Onyenwe anyị.”
30Ya mere, ndị nchụaja na ndị Livayị kwenyere ibu ọlaọcha na ọlaedo, na ngwongwo ihe nsọ ndị ahụ, buga ha nʼụlọnsọ ukwu Chineke dị na Jerusalem.