1Kraịst emeela ka anyị pụọ nʼohu, nʼihi anyị inwere onwe anyị. Ya mere, gbalịanụ ịhụ na unu e nyeghị onwe unu nʼọnọdụ ohu ọzọ.
2Geenụ m ntị, mụ onwe m bụ Pọl na-agwa unu nke a. Ọ bụrụ na unu anabata obibi ugwu, Kraịst agaghị abara unu uru ọbụla.
3Ka m kwuokwa ya ọzọ, onye ọbụla kweere ka e bie ya ugwu ji ụgwọ idebezu iwu niile ahụ.
4E kewapụla unu nʼebe Kraịst nọ, unu ndị a ga-agụnye na ndị ezi omume site nʼiwu. Unu adapụla nʼamara ya.