2Geenụ m ntị, mụ onwe m bụ Pọl na-agwa unu nke a. Ọ bụrụ na unu anabata obibi ugwu, Kraịst agaghị abara unu uru ọbụla.
3Ka m kwuokwa ya ọzọ, onye ọbụla kweere ka e bie ya ugwu ji ụgwọ idebezu iwu niile ahụ.
4E kewapụla unu nʼebe Kraịst nọ, unu ndị a ga-agụnye na ndị ezi omume site nʼiwu. Unu adapụla nʼamara ya.
5Nʼihi na anyị onwe anyị nwere olileanya na site nʼike nke Mmụọ Nsọ, a ga-agụ anyị na ndị ezi omume site nʼokwukwe anyị.
6Nʼihi nʼime Kraịst Jisọs, obibi ugwu maọbụ ebighị ugwu abaghị uru. Ihe dị mkpa bụ okwukwe nke na-egosi onwe ya site nʼịhụnanya.