6Nʼihi nʼime Kraịst Jisọs, obibi ugwu maọbụ ebighị ugwu abaghị uru. Ihe dị mkpa bụ okwukwe nke na-egosi onwe ya site nʼịhụnanya.
7Unu na-agbabu ọsọ nke ọma, onye gbochiri unu ikwenyere eziokwu ahụ?
8Ụdị nkwagide ahụ esiteghị nʼebe Onye ahụ kpọrọ unu bịa.
9Nwantịntị ihe na-eko achịcha na-eme ka ogbe ụtụ ọka a gwọrọ agwọ koo.
10Enwere m ntụkwasị obi nʼime Onyenwe anyị na unu agaghị eche echiche nʼụdị a ọzọ, ma ikpe ọmụma ga-adịrị onye ọbụla na-eduhie unu ọzọ.