7Unu na-agbabu ọsọ nke ọma, onye gbochiri unu ikwenyere eziokwu ahụ?
8Ụdị nkwagide ahụ esiteghị nʼebe Onye ahụ kpọrọ unu bịa.
9Nwantịntị ihe na-eko achịcha na-eme ka ogbe ụtụ ọka a gwọrọ agwọ koo.
10Enwere m ntụkwasị obi nʼime Onyenwe anyị na unu agaghị eche echiche nʼụdị a ọzọ, ma ikpe ọmụma ga-adịrị onye ọbụla na-eduhie unu ọzọ.
11Ụmụnna m, ọ bụrụ nʼezie na m na-ekwusa mkpa obibi ugwu dị, gịnị mere e ji nọgide na-akpagbu m? Ọ bụrụ na m mee otu ahụ, ewepụla m ihe ọdachi ahụ dị nʼobe.