19oke ala ndị Kenan sitere na Saịdọn ruo Gera, gbatịa ruo Gaza, ruokwa Sọdọm, Gọmọra, Adma na Zeboiim, nke dị nso Lasha.
20Ndị a bụ ụmụ ndị ikom Ham, dịka ikwu ha na asụsụ ha si dị, nʼoke ala ebe ha bi, na obodo ha dị iche iche.
21A mụụrụ Shem ụmụ ndị ikom, onye nwanne nwoke nke tọrọ ya bụ Jafet. Ọ bụkwa nna nna ochie ụmụ ndị ikom niile Eba mụtara.
22Ụmụ ndị ikom Shem bụ Elam, Ashua, Apakshad, Lud na Aram.
23Ụmụ ndị ikom Aram bụ, Uz, Hul, Geta na Meshek.