Jenesis 10

Kush bụ nna Nimrọd, onye mesịrị bụrụ dike nʼagha nʼụwa.

Genesis 10:8 (UKJV) And Cush brings forth Nimrod: he began to be a mighty one in the earth.

6Ụmụ ndị ikom Ham bụ: Kush, Ijipt, Put na Kenan.

7Ụmụ ndị ikom Kush bụ: Seba, Havila, Sabta, Raama na Sabteka. Ụmụ ndị ikom Raama bụ: Sheba na Dedan.

8Kush bụ nna Nimrọd, onye mesịrị bụrụ dike nʼagha nʼụwa.

9Ọ bụ dike nʼịchụ nta, nʼihu Onyenwe anyị. Ọ bụ nke a mere e ji na-ekwu okwu na-asị, “Ị dị ka Nimrọd, dike nʼịchụ nta, nʼihu Onyenwe anyị.”

10Obodo ndị bụ mmalite alaeze ya bụ, Babel, Erek, Akad na Kalne, ndị dị nʼala Shaịna.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.