5(Site nʼagbụrụ ndị a bi nʼakụkụ mmiri ka e nwetara mba dị iche iche, nʼagbụrụ ha nʼime obodo ha dị iche iche, ndị ọbụla nʼime ha nwekwara asụsụ nke ha.)
6Ụmụ ndị ikom Ham bụ: Kush, Ijipt, Put na Kenan.
7Ụmụ ndị ikom Kush bụ: Seba, Havila, Sabta, Raama na Sabteka. Ụmụ ndị ikom Raama bụ: Sheba na Dedan.
8Kush bụ nna Nimrọd, onye mesịrị bụrụ dike nʼagha nʼụwa.
9Ọ bụ dike nʼịchụ nta, nʼihu Onyenwe anyị. Ọ bụ nke a mere e ji na-ekwu okwu na-asị, “Ị dị ka Nimrọd, dike nʼịchụ nta, nʼihu Onyenwe anyị.”