17Mgbe ọ ghọrọ nna Peleg, ọ dịrị ndụ narị afọ anọ na iri atọ ọzọ mụta ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom.
18Peleg gbara iri afọ atọ mgbe ọ mụrụ Reu.
19Emesịa, mgbe ọ ghọrọ nna Reu, ọ dịrị ndụ narị afọ abụọ na itoolu ọzọ mụta ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom.
20Reu gbara iri afọ atọ na abụọ mgbe ọ mụrụ Serug.
21Emesịa, ọ dịrị ndụ narị afọ abụọ na asaa ọzọ, mgbe ọ mụsịrị Serug, ọ mụtakwara ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom.