19Emesịa, mgbe ọ ghọrọ nna Reu, ọ dịrị ndụ narị afọ abụọ na itoolu ọzọ mụta ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom.
20Reu gbara iri afọ atọ na abụọ mgbe ọ mụrụ Serug.
21Emesịa, ọ dịrị ndụ narị afọ abụọ na asaa ọzọ, mgbe ọ mụsịrị Serug, ọ mụtakwara ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom.
22Serug gbara iri afọ atọ mgbe ọ mụrụ Nahọ.
23Emesịa, mgbe ọ ghọrọ nna Nahọ, ọ dịrị ndụ narị afọ abụọ ọzọ mụta ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom.