Jenesis 12

Mgbe Ebram rutere Ijipt, ndị Ijipt hụrụ na nwunye ya bụ nwanyị mara mma.

Genesis 12:14 (UKJV) And it came to pass, that, when Abram was come into Egypt, the Egyptians beheld the woman that she was very fair.

12Mgbe ndị Ijipt ga-ahụ gị, ha ga-asị, ‘Onye a bụ nwunye ya.’ Mgbe ahụ, ha ga-egbu m ma hapụ gị ndụ.

13Gwa ha na ị bụ nwanne m nwanyị, ka ha meso m mmeso ọma nʼihi gị. Ha ga-echebekwa m ndụ nʼihi gị.”

14Mgbe Ebram rutere Ijipt, ndị Ijipt hụrụ na nwunye ya bụ nwanyị mara mma.

15Mgbe ndị ozi Fero hụrụ ya, ha toro ya nʼihu Fero. Nʼihi nke a, ha kpọbatara Serai nʼụlọeze Fero.

16Fero mesoro Ebram mmeso ọma nʼihi nwunye ya. Ebram nwetara igwe atụrụ, na ehi, na nne ịnyịnya ibu, oke na nwunye, na ndị ohu ndị nwoke na ndị nwanyị, na ịnyịnya kamel.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.