Jenesis 12

Aga m agọzi ndị na-agọzi gị, ma onye ọbụla kọchara gị ka m ga-akọcha; a ga-agọzikwa agbụrụ niile nọ nʼụwa site na gị.”

Genesis 12:3 (UKJV) And I will bless them that bless you, and curse him that curses you: and in you shall all families of the earth be blessed.

1Onyenwe anyị gwara Ebram okwu sị, “Site nʼobodo gị, sikwa na ụmụnna gị na ezinaụlọ nna gị, gaa nʼala m ga-egosi gị.

2“Aga m eme gị mba ukwu, aga m agọzi gị, aga m eme ka aha gị dị ukwuu, ị ga-abụ ngọzị.

3Aga m agọzi ndị na-agọzi gị, ma onye ọbụla kọchara gị ka m ga-akọcha; a ga-agọzikwa agbụrụ niile nọ nʼụwa site na gị.”

4Ya mere, Ebram hapụrụ gaa dịka Onyenwe anyị gwara ya. Lọt sokwa ya. Ebram agbaala iri afọ asaa na ise mgbe o si na Haran bulie ije.

5O duru nwunye ya Serai na Lọt nwa nwanne ya, chịkọtakwa akụ niile ha kpakọbara, na ndị ohu niile ha nwetara nʼala Haran, chee ihu ịga nʼala Kenan. Emesịa ha rutere nʼebe ahụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.