Jenesis 12

Emesịa, Ebram hapụrụ ebe ahụ chee ihu nʼala ugwu dị nʼọwụwa anyanwụ Betel, maa ụlọ ikwu ya. Obodo Betel dị nʼakụkụ ọdịda anyanwụ, ma obodo Ai dị nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ ebe ọ mara ụlọ ikwu ya. Nʼebe nsọ ahụ Ebram wuru ebe ịchụ aja, nọrọ nʼebe ahụ kpọkuo aha Onyenwe anyị.

Genesis 12:8 (UKJV) And he removed from thence unto a mountain on the east of Bethel, and pitched his tent, having Bethel on the west, and Hai on the east: and there he built an altar unto the LORD, and called upon the name of the LORD.

6Ebram jere ije nʼime ala Kenan jeruo nʼebe osisi ukwu More, nke dị nʼobodo Shekem. Ndị Kenan bi nʼala ahụ nʼoge ahụ.

7Onyenwe anyị mere ka Ebram hụ ya anya, ọ sịrị, “Aga m enye mkpụrụ gị ala a.” Ya mere, Ebram wuru ebe ịchụ aja nʼebe ahụ nye Onyenwe anyị onye gosiri ya onwe ya.

8Emesịa, Ebram hapụrụ ebe ahụ chee ihu nʼala ugwu dị nʼọwụwa anyanwụ Betel, maa ụlọ ikwu ya. Obodo Betel dị nʼakụkụ ọdịda anyanwụ, ma obodo Ai dị nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ ebe ọ mara ụlọ ikwu ya. Nʼebe nsọ ahụ Ebram wuru ebe ịchụ aja, nọrọ nʼebe ahụ kpọkuo aha Onyenwe anyị.

9Ọzọ, Ebram si nʼebe ahụ pụọ gaa ije rute Negev.

10Nʼoge ahụ, oke ụnwụ dara nʼala ahụ. Nʼihi ya, Ebram hapụrụ ala ahụ gaa nʼala Ijipt, ebe o biri nwa oge.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.