1Ebram na nwunye, na ihe niile ha nwere hapụrụ ala Ijipt, gaa ije bịaruo Negev. Lọt sokwa ha.
2Nʼoge a, Ebram aghọọla ọgaranya dị ukwuu, onye nwere akụnụba nke ọtụtụ anụ ụlọ, na ọlaọcha, na ọlaedo.
3Ha sitere na Negev pụọ ije site nʼotu ebe ruo nʼebe ọzọ tutu ha erute Betel, nʼebe dị nʼetiti Betel na Ai, ebe ọ mara ụlọ ikwu ya na mbụ.