Jenesis 13

Nʼoge a, Ebram aghọọla ọgaranya dị ukwuu, onye nwere akụnụba nke ọtụtụ anụ ụlọ, na ọlaọcha, na ọlaedo.

Genesis 13:2 (UKJV) And Abram was very rich in cattle, in silver, and in gold.

1Ebram na nwunye, na ihe niile ha nwere hapụrụ ala Ijipt, gaa ije bịaruo Negev. Lọt sokwa ha.

2Nʼoge a, Ebram aghọọla ọgaranya dị ukwuu, onye nwere akụnụba nke ọtụtụ anụ ụlọ, na ọlaọcha, na ọlaedo.

3Ha sitere na Negev pụọ ije site nʼotu ebe ruo nʼebe ọzọ tutu ha erute Betel, nʼebe dị nʼetiti Betel na Ai, ebe ọ mara ụlọ ikwu ya na mbụ.

4Nʼebe nsọ o wukwara ebe ịchụ aja na mbụ, nʼebe ahụ Ebram kpọkuru aha Onyenwe anyị.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.