Jenesis 13

Nʼebe nsọ o wukwara ebe ịchụ aja na mbụ, nʼebe ahụ Ebram kpọkuru aha Onyenwe anyị.

Genesis 13:4 (UKJV) Unto the place of the altar, which he had make there at the first: and there Abram called on the name of the LORD.

2Nʼoge a, Ebram aghọọla ọgaranya dị ukwuu, onye nwere akụnụba nke ọtụtụ anụ ụlọ, na ọlaọcha, na ọlaedo.

3Ha sitere na Negev pụọ ije site nʼotu ebe ruo nʼebe ọzọ tutu ha erute Betel, nʼebe dị nʼetiti Betel na Ai, ebe ọ mara ụlọ ikwu ya na mbụ.

4Nʼebe nsọ o wukwara ebe ịchụ aja na mbụ, nʼebe ahụ Ebram kpọkuru aha Onyenwe anyị.

5Ugbu a Lọt, onye ya na Ebram so na njem ya, bụkwa onye nwere akụnụba nke igwe ewu na atụrụ, na igwe ehi, na ọtụtụ ụlọ ikwu.

6Ma ala ebe ha nọ ezurughị ha mgbe ha nọkọrọ ọnụ nʼihi na ihe onwunwe ha dị ukwuu ruo na ha enweghị ike ịnọkọ ọnụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.