Jenesis 13

Ugbu a Lọt, onye ya na Ebram so na njem ya, bụkwa onye nwere akụnụba nke igwe ewu na atụrụ, na igwe ehi, na ọtụtụ ụlọ ikwu.

Genesis 13:5 (UKJV) And Lot also, which went with Abram, had flocks, and herds, and tents.

3Ha sitere na Negev pụọ ije site nʼotu ebe ruo nʼebe ọzọ tutu ha erute Betel, nʼebe dị nʼetiti Betel na Ai, ebe ọ mara ụlọ ikwu ya na mbụ.

4Nʼebe nsọ o wukwara ebe ịchụ aja na mbụ, nʼebe ahụ Ebram kpọkuru aha Onyenwe anyị.

5Ugbu a Lọt, onye ya na Ebram so na njem ya, bụkwa onye nwere akụnụba nke igwe ewu na atụrụ, na igwe ehi, na ọtụtụ ụlọ ikwu.

6Ma ala ebe ha nọ ezurughị ha mgbe ha nọkọrọ ọnụ nʼihi na ihe onwunwe ha dị ukwuu ruo na ha enweghị ike ịnọkọ ọnụ.

7Nke a mere esemokwu ji dapụta nʼetiti ndị ọzụzụ anụ ụlọ Ebram na ndị ọzụzụ anụ ụlọ Lọt. Ndị Kenan na ndị Periz bikwa nʼala ahụ nʼoge ahụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.