14Mgbe Lọt siri nʼebe ahụ pụọ, Onyenwe anyị gwara Ebram okwu sị ya, “Site nʼebe ahụ ị nọ lelie anya gị, lee anya nʼugwu na ndịda, nʼọwụwa anyanwụ na ọdịda anyanwụ.
15Ala ahụ niile ị hụrụ ka m ga-enye gị na mkpụrụ gị ruo mgbe ebighị ebi.
16Aga m eme ka mkpụrụ gị baa ụba dịka aja dị nʼala. Ọ bụrụ na mmadụ enwe ike ịgụta ọnụọgụgụ aja dị nʼala, ha ga-enwe ike gụta ọnụọgụgụ mkpụrụ gị.
17Bilie jegharịa nʼala ahụ niile nʼakụkụ ya ọbụla, nʼihi na ana m enye gị ha niile.”
18Ya mere, Ebram bugharịrị ụlọ ikwu ya, gaa biri nʼakụkụ osisi ukwu Mamre nke dị na Hebrọn. O wuru ebe ịchụ aja nye Onyenwe anyị nʼebe ahụ.