Jenesis 14

Ma eze anọ ndị a banyere nʼime obodo Sọdọm na Gọmọra bukọrọ akụ ha, na ihe oriri ha niile laa.

Genesis 14:11 (UKJV) And they took all the goods of Sodom and Gomorrah, and all their victuals, and went their way.

9imegide Kedoloma eze Elam, Tidal eze Goiim, Amrafel eze Shaịna na Ariok eze Elasa. Ya bụ eze ise buru agha megide eze anọ.

10Ma Ndagwurugwu Sidim jupụtara nʼolulu apịtị. Mgbe ndị agha eze Sọdọm na Gọmọra bidoro ịgba ọsọ. Ụfọdụ nʼime ha dabanyere nʼime olulu ndị a, ma ndị fọdụrụ gbapụrụ ọsọ gbaga nʼugwu.

11Ma eze anọ ndị a banyere nʼime obodo Sọdọm na Gọmọra bukọrọ akụ ha, na ihe oriri ha niile laa.

12Ha buuru Lọt, nwa nwanne Ebram, onye bi na Sọdọm na ihe niile o nwere, buru ha na-ala ebe ha si bịa.

13Ma otu onye gbara ọsọ ndụ site nʼebe ahụ gara kọọrọ Ebram onye Hibru ihe mere. Nʼoge a, Ebram bi nʼebe dị nso nʼosisi ukwu nke Mamre, onye Amọrị, nwanne Eshkọl na Anea, ndị ha na Ebram gbara ndụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.