Jenesis 14

Ebram nwetaghachiri ihe niile ahụ ha dọtara nʼagha, dulata nwanne ya Lọt, na ihe onwunwe ya niile, tinyere ndị inyom, na ndị ọzọ niile a dọtara nʼagha.

Genesis 14:16 (UKJV) And he brought back all the goods, and also brought again his brother Lot, and his goods, and the women also, and the people.

14Mgbe Ebram nụrụ na adọrọla Lọt nwa nwanne ya nʼagha, ọ kpọkọtara ndị ikom a zụrụ azụ na-ejere ya ozi, ndị a mụrụ nʼụlọ ya. Ọnụọgụgụ ha dị narị ndị ikom atọ na iri na asatọ, ha chụrụ ndị agha ahụ ọsọ tutu ha erute Dan.

15Nʼabalị, Ebram kere ndị agha ya ibuso ndị ahụ agha. O meriri ha, chụọ ha ọsọ, chụruo ha Hoba, nke dị nʼakụkụ ugwu Damaskọs.

16Ebram nwetaghachiri ihe niile ahụ ha dọtara nʼagha, dulata nwanne ya Lọt, na ihe onwunwe ya niile, tinyere ndị inyom, na ndị ọzọ niile a dọtara nʼagha.

17Mgbe Ebram si na mmeri ahụ o meriri Kedoloma na eze ndị ọzọ ahụ na-alọta, eze Sọdọm bịara zute ya na Ndagwurugwu Shave (nke a na-akpọ Ndagwurugwu Eze).

18Melkizedek, eze Salem, onye nchụaja Chineke nke kachasị ihe niile elu, wepụtara achịcha na mmanya,

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.