Jenesis 14

Melkizedek, eze Salem, onye nchụaja Chineke nke kachasị ihe niile elu, wepụtara achịcha na mmanya,

Genesis 14:18 (UKJV) And Melchizedek king of Salem brought forth bread and wine: and he was the priest of the most high God.

16Ebram nwetaghachiri ihe niile ahụ ha dọtara nʼagha, dulata nwanne ya Lọt, na ihe onwunwe ya niile, tinyere ndị inyom, na ndị ọzọ niile a dọtara nʼagha.

17Mgbe Ebram si na mmeri ahụ o meriri Kedoloma na eze ndị ọzọ ahụ na-alọta, eze Sọdọm bịara zute ya na Ndagwurugwu Shave (nke a na-akpọ Ndagwurugwu Eze).

18Melkizedek, eze Salem, onye nchụaja Chineke nke kachasị ihe niile elu, wepụtara achịcha na mmanya,

19ọ gọziri Ebram sị ya, “Ngọzị dịrị Ebram site nʼaka Chineke nke kachasị ihe niile elu, Onye kere eluigwe na ụwa.

20Ngọzị dịkwara Chineke nke kachasị ihe niile elu, onye weere ndị iro gị nyefee gị nʼaka.” Mgbe ahụ, Ebram nyere ya otu ụzọ nʼime ụzọ iri nke ihe niile.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.