Jenesis 14

ọ gọziri Ebram sị ya, “Ngọzị dịrị Ebram site nʼaka Chineke nke kachasị ihe niile elu, Onye kere eluigwe na ụwa.

Genesis 14:19 (UKJV) And he blessed him, and said, Blessed be Abram of the most high God, possessor of heaven and earth:

17Mgbe Ebram si na mmeri ahụ o meriri Kedoloma na eze ndị ọzọ ahụ na-alọta, eze Sọdọm bịara zute ya na Ndagwurugwu Shave (nke a na-akpọ Ndagwurugwu Eze).

18Melkizedek, eze Salem, onye nchụaja Chineke nke kachasị ihe niile elu, wepụtara achịcha na mmanya,

19ọ gọziri Ebram sị ya, “Ngọzị dịrị Ebram site nʼaka Chineke nke kachasị ihe niile elu, Onye kere eluigwe na ụwa.

20Ngọzị dịkwara Chineke nke kachasị ihe niile elu, onye weere ndị iro gị nyefee gị nʼaka.” Mgbe ahụ, Ebram nyere ya otu ụzọ nʼime ụzọ iri nke ihe niile.

21Eze Sọdọm gwara Ebram sị, “Nyeghachi m naanị ndị mmadụ, ma debere onwe gị ihe ndị ọzọ.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.