Jenesis 15

Mgbe ọgbọ anọ gasịrị, ụmụ ụmụ gị ga-alọtakwa nʼala a. Nʼihi na mmehie ndị Amọrait erubeghị nʼuju ya.”

Genesis 15:16 (UKJV) But in the fourth generation they shall come here again: for the iniquity of the Amorites is not yet full.

14Ma aga m ata mba ahụ ha na-efe dịka ohu ahụhụ. Nʼikpeazụ, ha ga-eji ọtụtụ akụ si nʼebe ahụ pụta.

15Ma ị ga-anwụ nʼudo. A ga-eli gị mgbe ị kara ezi nka.

16Mgbe ọgbọ anọ gasịrị, ụmụ ụmụ gị ga-alọtakwa nʼala a. Nʼihi na mmehie ndị Amọrait erubeghị nʼuju ya.”

17Mgbe anwụ dara, mgbe ọchịchịrị gbachiri ebe niile, ite ọkụ na-akwụ anwụrụ ọkụ nke nwere ọwa na-enwu ọkụ si nʼetiti ibe anụ ndị ahụ gafee.

18Nʼụbọchị ahụ ka Onyenwe anyị na Ebram gbara ndụ. Ọ sị, “Ndị agbụrụ gị ka m ga-enye ala ndị a, malite nʼiyi ndị Ijipt ruo nʼiyi ukwu Yufretis.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.