Jenesis 15

Ma aga m ata mba ahụ ha na-efe dịka ohu ahụhụ. Nʼikpeazụ, ha ga-eji ọtụtụ akụ si nʼebe ahụ pụta.

Genesis 15:14 (UKJV) And also that nation, whom they shall serve, will I judge: and afterward shall they come out with great substance.

12Mgbe anwụ bidoro ịda, Ebram dara nʼoke ụra, oke ụjọ na oke ọchịchịrị dakwasịrị ya.

13Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara ya sị, “Mata nke ọma na ụmụ ụmụ gị ga-anọ dịka ndị ọbịa nʼala na-abụghị nke ha. A ga-edo ha ọnọdụ dịka ndị ohu, mejọọ ha narị afọ anọ.

14Ma aga m ata mba ahụ ha na-efe dịka ohu ahụhụ. Nʼikpeazụ, ha ga-eji ọtụtụ akụ si nʼebe ahụ pụta.

15Ma ị ga-anwụ nʼudo. A ga-eli gị mgbe ị kara ezi nka.

16Mgbe ọgbọ anọ gasịrị, ụmụ ụmụ gị ga-alọtakwa nʼala a. Nʼihi na mmehie ndị Amọrait erubeghị nʼuju ya.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.