7Onyenwe anyị gwakwara ya sị, “Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị, onye si nʼala Ụọ nke ndị Kaldịa kpọpụta gị, inye gị ala a ka ọ bụrụ ihe nweta gị.”
8Ma Ebram zara sị, “Biko, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị olee otu m ga-esi mara na m ga-enweta ya?”
9Onyenwe anyị zara sị ya, “Wetara m nwa nne ehi gbara afọ atọ, na nne ewu gbara afọ atọ, na ebule gbara afọ atọ, na nduru, na nwa kpalakwukwu.”
10Ebram wetaara ya ihe ndị a niile bọwaa ha ụzọ abụọ, doo ha nʼusoro ka otu akụkụ chee akụkụ nke ọzọ ihu. Ma ọ bọwaghị ụmụ nnụnụ ndị ahụ.
11Mgbe anụ ufe fekwasịrị ozu anụ ndị ahụ, Ebram chụpụrụ ha.