10Mmụọ ozi Onyenwe anyị sịkwa ya, “Aga m amụba ụmụ gị, ka a hapụ inwe ike ịgụta ole ha dị.”
11Mmụọ ozi Onyenwe anyị gwakwara ya sị, “Ị dị ime ugbu a, ị ga-amụ nwa nwoke. Aha ị ga-agụ ya bụ Ishmel nʼihi na Onyenwe anyị anụla maka nhụju anya gị.
12Nwoke dịka ịnyịnya ibu a na-azụghị azụ ka ọ ga-abụ. Ọ ga-emegide onye ọbụla, onye ọbụla ga-emegidekwa ya. Ọ ga-ebi nʼime ibu iro, megide ụmụnna ya niile.”
13Hega kpọkuru aha Onyenwe anyị, onye gwara ya okwu sị, “Ị bụ Chineke m na-ahụ m.” Nʼihi na Hega kwuru sị, “Ahụla m, ugbu a, onye ahụ na-ahụ m.”
14Ọ bụ ya mere e ji na-akpọ olulu mmiri ahụ, Bịa-Lahai-Rọị. Ọ ka dị ebe ahụ, nʼetiti Kadesh na Bered.