10Nke a bụ ọgbụgba ndụ dị nʼetiti mụ na gị na ụmụ ụmụ gị ndị ga-esote gị, ọgbụgba ndụ nke unu na-aghaghị idebe. A ga-ebi nwoke ọbụla nʼetiti unu ugwu.
11A ga-ebi unu ugwu, bipụ elu ahụ nke anụ ahụ unu. Nke a ga-abụ ihe ama nke ọgbụgba ndụ dị nʼetiti mụ na unu.
12Nʼoge ọ gbara mkpụrụ ụbọchị asatọ, unu ga-ebi nwoke ọbụla nʼagbụrụ unu ugwu: ndị a mụrụ nʼụlọ, maọbụ ndị eji ego zụta site nʼaka ndị mba ọzọ, ndị na-esighị na mkpụrụ nke afọ gị.
13A ga-ebi ha niile ugwu. Ma a mụrụ ha nʼezinaụlọ gị ma i ji ego zụta ha site nʼaka onye mba ọzọ. Ọgbụgba ndụ m nke ga-apụta ihe nʼanụ ahụ gị bụ ọgbụgba ndụ ebighị ebi.
14Nwoke ọbụla a na-ebighị ugwu nke anụ ahụ ka a ga-ebipụ site nʼetiti ụmụnna ya. Nʼihi na o mehiela megide ọgbụgba ndụ m.”